16Ma mgbe onye ọbụla tụgharịrị nʼebe Onyenwe anyị nọ, a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ.
17Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.
18Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.