2 Ndị Kọrint 3

Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke.

2 Corinthians 3:5 (UKJV) Not that we are sufficient of ourselves to think any thing as of ourselves; but our sufficiency is of God;

3Unu na-egosikwa na unu bụ akwụkwọ ozi si nʼebe Kraịst nọ, mpụta ihe nke ozi anyị jere. Ọ bụghị ihe e ji inki dee na mbadamba nkume, kama ọ bụ mmụọ Chineke na-adị ndụ ka e ji dee ya na mbadamba obi mmadụ.

4Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ.

5Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke.

6Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ.

7Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.