2 Ndị Kọrint 4

Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ.

2 Corinthians 4:11 (UKJV) For we which live are always delivered unto death for Jesus' sake, that the life also of Jesus might be made manifest in our mortal flesh.

9A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi.

10Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị.

11Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ.

12Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu.

13Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.