8Obi siri anyị ike. Ọ gaara amasị anyị ịhapụ ụlọ nke a anyị bi na ya, bụ ahụ anyị ma lakwuru Onyenwe anyị nʼebe obibi ya.
9Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ.
10Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ.
11Ọ bụ nʼihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ka ndị mmadụ mata Chineke makwaara ụdị mmadụ anyị bụ. Enwekwara m olileanya na nke a pụtara ihe nye akọnuche unu.
12Anyị adịghị agbalị ịgwa unu na anyị dị mma, kama anyị chọrọ inye unu ihe unu ga-eji nyaa isi mgbe unu na-ekwu ihe banyere anyị, ka unu nwee ike ịmata ihe unu ga-azaghachi ndị ahụ na-anya isi banyere ihe ha ji anya ha hụ, kama ihe dị mmadụ nʼobi.