2 Ndị Kọrint 5

Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo.

2 Corinthians 5:20 (UKJV) Now then we are ambassadors for Christ, as though God did plead to you by us: we pray you in Christ's position, be all of you reconciled to God.

18Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nʼaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nʼudo. Ma ugbu a, o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nʼudo.

19Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị na mma. Ọ dịghị agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie niile, kama o tinyela nʼaka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.

20Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo.

21Nʼihi na o mere ka onye ahụ na-amaghị mmehie bụrụ mmehie nʼọnọdụ anyị, ka esi otu a mee ka anyị nwee oke nʼime ezi omume Chineke site na ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.