12Anyị ji obi anyị niile hụ unu nʼanya, ma unu mechiri obi unu nʼebe anyị nọ.
13Ugbu a, ana m ekwu dịka ana m agwa ụmụntakịrị. Na-emesonu anyị dịka anyị si emeso unu, meenụ ka obi unu saa mbara nʼebe anyị nọ.
14Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ?
15Ọ bụ nwekọ dị aṅaa dị na-agbata Kraịst na ekwensu? Gịnịkwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ?
16Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru, “M ga-ebi nʼime ha. Jegharịakwa nʼime ha. M ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”