12Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nʼihi onye ahụ mehiere, maọbụ nʼihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Chineke gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nʼobi.
13Nʼụzọ niile ndị a, anyị bụ ndị a gbara ume site nʼịhụnanya unu nwere nʼebe anyị nọ. A gbara anyị ume karịa site na ịhụ ọṅụ Taịtọs nʼihi nnabata unu nabatara, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu.
14Nʼihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyara m isi nʼihu ya banyere unu; ugbu a, obi dị m ụtọ nke ukwuu nʼihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a, ịnya isi m nʼebe Taịtọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu.
15Ugbu a, ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ na-aba ụba nke ukwuu, nʼihi ncheta ọ na-echeta otu unu niile si jiri ọṅụ gee ya ntị na otu unu si jiri ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji nabata ya.
16Nke a na-enyekwa m obi ụtọ nʼihi na enwere m ntụkwasị obi nʼebe unu nọ nʼime ihe niile.