6Ma otu ọ dị, Chineke, onye na-agba ndị ike gwụrụ ume, gbara anyị ume site nʼọbịbịa Taịtọs.
7Ọ bụkwaghị naanị nʼihi na ọbịbịa ọ bịara nyere anyị obi ụtọ, kama akụkọ o ji bịa, gbasara otu unu si gbaa ya ume, gwakwa anyị otu unu si na-ele anya ịhụ m, na otu unu si na-eru ụjụ nʼihi ihe niile mere, na otu unu si guzosie ike nʼukwu m, na ụdị ịhụnanya unu nwere nʼebe m nọ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
8Ọ naghị ewutekwa m ugbu a na m deere unu akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na o wutere m mgbe ahụ m na-ede ya, nʼihi na amaara m na ọ ga-ewetara unu obi ọjọọ mgbe unu gụrụ ya. Ma obi ọjọọ ahụ abụrụla naanị nke nwa oge nta.
9Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nʼihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nʼihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nʼihi akwụkwọ anyị deere unu.
10Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ.