12Nʼihi na ọ bụrụ na ịnụ ọkụ nʼobi dị ebe ahụ, a na-anara ya dịka ihe mmadụ nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye.
13Nzube m abụghị ka unu nye nʼụzọ ihe ga-esi siere unu ike nʼihi na unu nyere. Kama ka e nwe nhatanha.
14Ugbu a, ọ bụ ihe dị mma ka unu nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Mgbe unu ga-anọkwa na mkpa, ha ga-enyere unu aka ma ha nwee hie nne. Nʼụzọ dị otu a, a ga-enwe nhatanha.
15Nke a bụkwa ihe akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ahụ chịkọtara hie nne enweghị karịa. Onye nke chịkọtara ihe dị nta enweghị ihe fọdụrụ ya inweta ihe ọ chọrọ.”
16Ekelere m Chineke onye tinyere nʼobi Taịtọs otu ịnụ ọkụ ahụ banyere unu ekele, dịka o si emetụ m nʼobi.