16Ekelere m Chineke onye tinyere nʼobi Taịtọs otu ịnụ ọkụ ahụ banyere unu ekele, dịka o si emetụ m nʼobi.
17Ọ bụghị naanị na o kweere ime dịka anyị si rịọrọ ya, kama nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ, o kpebiri nʼime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka.
18Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị onye ahụ nzukọ niile na-asọpụrụ nʼihi ọrụ ikwusa oziọma ahụ.
19Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka.
20Anyị na-eze ka onye ọbụla ghara ịta anyị ụta nʼihe ọbụla, nʼihi ụzọ anyị si jee ozi gbasara onyinye mgbasapụ aka a.