2 Ndị Kọrint 8

Nʼime ọnọdụ oke mkpagbu na ihe mwute, ha nwere ọṅụ dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, wezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ.

2 Corinthians 8:2 (UKJV) How that in a great trial of affliction the abundance of their joy and their deep poverty abounded unto the riches of their liberality.

1Anyị chọrọ ime ka unu mara, ụmụnna m, ihe banyere ihe nke amara Chineke rụrụ na nzukọ niile dị na Masidonia.

2Nʼime ọnọdụ oke mkpagbu na ihe mwute, ha nwere ọṅụ dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, wezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ.

3Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta.

4Nʼezie, ha rịọsiri anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye amara ha nyere nʼihi iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.