2 Ndị Kọrint 8

Ya mere, gosinụ ha ihe ga-eme ka ha mata na unu hụrụ ha nʼanya. Meekwanụ ka ha mata ihe bụ ịnya isi anyị banyere unu, ka chọọchị niile hụkwa ya.

2 Corinthians 8:24 (UKJV) Wherefore show all of you to them, and before the churches, the proof of your love, and of our boasting on your behalf.

22Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nʼobi inyeaka. Ugbu a, o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nʼebe unu nọ.

23Ma banyere Taịtọs, ọ bụ onye otu m nʼọrụ a, bụrụkwa onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nʼetiti unu. Ma banyere ụmụnna anyị ndị ọzọ a, ha bụ ndị na-anọchite anya nzukọ, na ndị na-ewetara Kraịst otuto.

24Ya mere, gosinụ ha ihe ga-eme ka ha mata na unu hụrụ ha nʼanya. Meekwanụ ka ha mata ihe bụ ịnya isi anyị banyere unu, ka chọọchị niile hụkwa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.