5Ọ bụ nke a mere m ji hụ na ọ dị mkpa ịrịọ ụmụnna anyị ka ha buru ụzọ bịa, tupu m bịa. Ka unu nwee ike ịkwado onyinye ahụ unu kwere na nkwa inye, jide ya na njikere ruo mgbe m bịara. Ka unu si otu a gosi ndị mụ na ha ga-eso na unu na-enye nʼihi na unu chọrọ inye, ọ bụkwaghị nʼihi na a gwara unu ka unu nye.
6Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne.
7Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya.
8Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma.
9Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.”