2 Jọn 1

Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya.

2 John 1:11 (UKJV) For he that bids him God speed is partaker of his evil deeds.

9Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi Kraịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere Nna na Ọkpara ya.

10Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa izi unu ihe ọzọ dị iche site nʼozizi a, unu akpọbatala ya nʼụlọ unu, maọbụ nabatakwa ya.

11Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya.

12Ọ bụ ezie na enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere unu, ma achọghị m iji akwụkwọ na inki dee ha. Kama, ana m ele anya ịbịa leta unu ka mụ na unu kwukọrịta okwu ihu nʼihu, ka e sikwa otu a mee ka ọṅụ anyị zuo oke.

13Ụmụ nwanne gị nwanyị, bụ onye a họpụtara, na-ekele unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.