2 Ndị Eze 1

Moab nupuru isi megide Izrel mgbe Ehab nwụrụ.

2 Kings 1:1 (UKJV) Then Moab rebelled against Israel after the death of Ahab.

1Moab nupuru isi megide Izrel mgbe Ehab nwụrụ.

2Nʼoge a, Ahazaya sitere na mgbe ụlọ elu ya dị na Sameria daa, merụọ ahụ nke ukwuu. Nʼihi ọrịa a, o zigara ndị ozi, sị ha, “Gaa jụta ase nʼaka Baal-Zebub, bụ chi Ekrọn, ma m ga-adịrị site nʼihe mmerụ ahụ a.”

3Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja onye Tishbe okwu sị ya, “Gaa zute ndị ozi eze Sameria zipụrụ, jụọ ha sị, ‘Gịnị mere unu ji aga Ekrọn ịjụ ase? Ọ bụ na Chineke anọghị nʼIzrel mere unu ji aga ịjụ Baal-Zebub ase ịmata ma eze ọ ga-adị ndụ?’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.