2 Ndị Eze 1

Ọ nwụrụ dịka okwu Onyenwe anyị nke Ịlaịja kwuru si dị. Nʼihi na Ahazaya enweghị nwa nwoke ọbụla, Jehoram nọchiri anya ya dịka eze, nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoram nwa Jehoshafat, bụ eze Juda.

2 Kings 1:17 (UKJV) So he died according to the word of the LORD which Elijah had spoken. And Jehoram reigned in his position in the second year of Jehoram the son of Jehoshaphat king of Judah; because he had no son.

15Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja okwu sị ya, “Atụla egwu! Soro ya gaa!” Ya mere, Ịlaịja sooro onyeisi agha ahụ gaa nʼihu eze.

16Mgbe Ịlaịja ruru nʼihu eze, ọ gwara eze okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị ozi ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ị ga-anwụrịrị!”

17Ọ nwụrụ dịka okwu Onyenwe anyị nke Ịlaịja kwuru si dị. Nʼihi na Ahazaya enweghị nwa nwoke ọbụla, Jehoram nọchiri anya ya dịka eze, nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoram nwa Jehoshafat, bụ eze Juda.

18Akụkọ banyere ịbụ eze nke Ahazaya, na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.