2 Ndị Eze 10

O nyere iwu sị, “Jidenụ ha na ndụ.” Ha jidere ha na ndụ, gbukwaa ha niile nʼakụkụ olulu miri nke Bet-Eked. Ọnụọgụgụ ha dị iri anọ na abụọ. O nweghị onye ọbụla ọ hapụrụ ndụ.

2 Kings 10:14 (UKJV) And he said, Take them alive. And they took them alive, and slew them at the pit of the shearing house, even two and forty men; neither left he any of them.

12Emesịakwa, Jehu hapụrụ Jezril gaa Sameria. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe a na-akpọ Ebe Izuike Ndị ọzụzụ atụrụ.

13Nʼebe ahụ, o zutere ndị ụmụnna Ahazaya, eze Juda, jụọ sị, “Olee ndị ka unu bụ?” Ha zara, “Anyị bụ ndị ikwu Ahazaya, eze Juda, anyị bịara ka anyị jụọ maka ọdịmma ndị ezinaụlọ eze na nne eze.”

14O nyere iwu sị, “Jidenụ ha na ndụ.” Ha jidere ha na ndụ, gbukwaa ha niile nʼakụkụ olulu miri nke Bet-Eked. Ọnụọgụgụ ha dị iri anọ na abụọ. O nweghị onye ọbụla ọ hapụrụ ndụ.

15Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o zutere Jehonadab nwa Rekab, ka ọ na-abịa izute ya. Jehu kelere ya, sị, “Obi gị, o ziri ezi nwee nkwekọrịta, dịka obi m dị nʼebe ị nọ?” Jehonadab zara sị ya, “E.” Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, kwe m nʼaka.” Jehonadab kwere ya nʼaka. Jehu nʼonwe ya nyeere ya aka ka ọ rigota nʼụgbọ agha ya.

16Mgbe ahụ, Jehu sịrị ya, “Ugbu a, soro m bịa lee ụdị ịnụ ọkụ nʼobi m nwere maka ọrụ Onyenwe anyị.” Ha abụọ sooro nʼụgbọ agha Jehu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.