2 Ndị Eze 10

Akụkọ gbasara ọchịchị eze Jehu, na ihe niile o mere, na ịkpa ike ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel?

2 Kings 10:34 (UKJV) Now the rest of the acts of Jehu, and all that he did, and all his might, are they not written in the book of the chronicles of the kings of Israel?

32Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị malitere ime ka ndị Izrel bido ịdị nta. Hazael eze Aram, buru agha merie ọtụtụ akụkụ Izrel,

33nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ala niile nke Gilead (nʼoke ala ndị Gad, na nke ndị Ruben, na Manase), site nʼAroea nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, ruo Gilead na Bashan.

34Akụkọ gbasara ọchịchị eze Jehu, na ihe niile o mere, na ịkpa ike ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel?

35Jehu sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya bụ Jehoahaz nọchiri anya ya dịka eze.

36Ma ụbọchị niile Jehu bụ eze Izrel nʼime Sameria dị iri afọ abụọ na asatọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.