6Ma ha esighị na mmehie niile nke ụlọ Jeroboam wezuga onwe ha, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie, kama ha nọ na-ejegharị nʼime ha. Ọzọkwa, ogidi Ashera ka guzoro na Sameria.
7Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ.
8Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoahaz, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
9Jehoahaz sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya Jehoash nọchiri anya ya.
10Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii.