20Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya na Jerusalem nʼebe e liri ndị nna nna ya ha, nʼobodo Devid.
21Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya.
22Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.
23Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze.
24Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie.