26Onyenwe anyị hụrụ ọnọdụ ọjọọ nke ndị Izrel nọ nʼime ya; onye ọbụla nʼime ha, ohu na onye nwe onwe ya, nọ nʼoke ahụhụ. Ọ dịkwaghị onye inyeaka ọbụla ha nwere.
27Ma ọ bụghị uche Onyenwe anyị ịla Izrel nʼiyi kpamkpam nʼokpuru eluigwe, nʼihi ya ka o mere ka Jeroboam nwa Jehoash napụta ha site nʼaka ndị iro ha.
28Akụkọ niile gbasara ihe niile Jeroboam mere, na ike ya niile, na agha niile o buru, na otu o si nwetaghachiri ndị Izrel obodo Damaskọs na Hamat, bụ obodo ndị Juda, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?
29Jeroboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ndị eze Izrel nwụrụ anwụ. Ma Zekaraya nwa ya ghọrọ eze Izrel nʼọnọdụ ya.