14Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya.
15Akụkọ ndị ọzọ gbasara Shalum na izu ọjọọ ya, e deghị ha nʼakwụkwọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel na-achị.
16Nʼoge ahụ, Menahem sitere na Tịaza buso obodo Tipsa agha, na onye ọbụla bi nʼobodo ahụ na gburugburu ya nʼihi na ha ekweghị emeghe ọnụ ụzọ ama ha. O tigburu Tifsa kwakọrọ ihe niile, bọwakwaa afọ ndị inyom niile dị ime.
17Nʼafọ iri atọ na itoolu nke Azaraya, eze Juda, Menahem nwa Gadi ghọrọ eze ọhụrụ ndị Izrel. Ọ chịrị afọ iri dịka eze na Sameria.
18O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼoge ọchịchị ya, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o mere ka Izrel mehie.