2 Ndị Eze 15

Azaraya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼebe e liri ha, nʼime obodo Devid. Jotam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

2 Kings 15:7 (UKJV) So Azariah slept with his fathers; and they buried him with his fathers in the city of David: and Jotham his son reigned in his position.

5Onyenwe anyị tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ.

6Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Azaraya, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?

7Azaraya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼebe e liri ha, nʼime obodo Devid. Jotam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

8Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Azaraya bụ eze Juda, ka Zekaraya, nwa Jeroboam ghọrọ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị ọnwa isii.

9Dịka ndị nna ya bu ya ụzọ si mee, Zekaraya mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O mekwara dịka Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie ịkpọ isiala nye chi ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.