2 Ndị Eze 17

Ha jụrụ ụkpụrụ ya niile na ọgbụgba ndụ ya, nke ya na ndị bụ nna nna ha gbara na iwu nke ọ dọrọ ha aka na ntị ka ha debe. Ha gbasooro chi arụsị bụ ihe efu, ha onwe ha ghọkwara ihe efu. Ha ṅomiri mba dị iche iche ndị ahụ bi ha gburugburu, nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị nyere ha iwu sị, “Unu emela dịka ha.”

2 Kings 17:15 (UKJV) And they rejected his statutes, and his covenant that he made with their fathers, and his testimonies which he testified against them; and they followed vanity, and became vain, and went after the heathen that were round about them, concerning whom the LORD had charged them, that they should not do like them.

13Mgbe niile ka Onyenwe anyị na-eziga ndị amụma ya, na ndị ọhụ ụzọ, ịdọ Izrel na Juda aka na ntị, sị ha, “Sitenụ nʼajọ ihe unu na-eme chegharịa. Debenụ iwu na ụkpụrụ m, dịka iwu ahụ niile m nyere nna unu ha ka ha debe si dị, nke m sikwa nʼọnụ ndị ozi m bụ ndị amụma nye unu.”

14Ma ndị Izrel jụrụ ige ntị. Kama ha kpachara anya kwesie olu ha ike dịka nna nna ha mere, bụ ndị na-ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke ha.

15Ha jụrụ ụkpụrụ ya niile na ọgbụgba ndụ ya, nke ya na ndị bụ nna nna ha gbara na iwu nke ọ dọrọ ha aka na ntị ka ha debe. Ha gbasooro chi arụsị bụ ihe efu, ha onwe ha ghọkwara ihe efu. Ha ṅomiri mba dị iche iche ndị ahụ bi ha gburugburu, nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị nyere ha iwu sị, “Unu emela dịka ha.”

16Ha jụrụ idebe iwu niile Onyenwe anyị Chineke ha nyere ha. Ha meere onwe ha ogidi arụsị Ashera, kpụọrọ onwe ha oyiyi ụmụ ehi abụọ. Ha kpọrọ isiala nye Baal, na anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando.

17Ha jiri ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom chụọ aja nsure ọkụ nye chi ndị mba ọzọ. Ha gakwara nʼaja ịjụ ase, na ịgba aja, si otu a nyefee onwe ha nʼaka ime ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.