2 Ndị Eze 17

Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ ndị Izrel niile. Ọ tara ha ahụhụ site nʼinyefe ha nʼaka ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike tutu ruo mgbe o mere ka e site nʼihu ya wezuga ha.

2 Kings 17:20 (UKJV) And the LORD rejected all the seed of Israel, and afflicted them, and delivered them into the hand of spoilers, until he had cast them out of his sight.

18Ya mere, Onyenwe anyị wesoro Izrel iwe nke ukwuu, wezuga ha site nʼihu ya. Ọ dịkwaghị onye o kwere ka ọ fọdụ, karịakwa naanị ebo Juda.

19Ma ndị Juda jụkwara idebe ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke ha nyere ha nʼiwu. Ha sooro omume ọjọọ ndị Izrel webatara.

20Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ ndị Izrel niile. Ọ tara ha ahụhụ site nʼinyefe ha nʼaka ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike tutu ruo mgbe o mere ka e site nʼihu ya wezuga ha.

21Mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel dọwapụ onwe ha site nʼalaeze Devid, ha mere Jeroboam nwa Nebat, eze ha. Ma Jeroboam mere ka Izrel site nʼiso Onyenwe anyị wezuga onwe ha. O mere ka ha mee mmehie dị ukwuu.

22Ọ dịkwaghị mgbe ụmụ Izrel sitere nʼime mmehie ahụ Jeroboam dubara ha pụta,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.