2 Ndị Eze 17

Ma eze Asịrịa chọpụtara na Hoshea abụghị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihi na Hoshea eze Izrel zipụrụ ndị ozi ya ka ha jekwuru So, eze Ijipt, maka enyemaka. Ọzọkwa, Hoshea kwụsịrị ịtụ ụtụ nye eze Asịrịa dịka ọ na-eme kwa afọ. Nʼihi ya Shalmanesa nwụchiri ya, tinye ya nʼụlọ mkpọrọ.

2 Kings 17:4 (UKJV) And the king of Assyria found conspiracy in Hoshea: for he had sent messengers to So king of Egypt, and brought no present to the king of Assyria, as he had done year by year: therefore the king of Assyria shut him up, and bound him in prison.

2O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị mgbe ọ bụ eze. Ma ọ bụghị dịka ndị eze Izrel ndị ọzọ bu ya ụzọ.

3Shalmanesa eze Asịrịa bịara buso Hoshea agha, nʼihi na Hoshea nọ nʼokpuru ọchịchị eze Asịrịa, bụrụkwa onye na-atụ ụtụ nye ya kwa afọ.

4Ma eze Asịrịa chọpụtara na Hoshea abụghị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihi na Hoshea eze Izrel zipụrụ ndị ozi ya ka ha jekwuru So, eze Ijipt, maka enyemaka. Ọzọkwa, Hoshea kwụsịrị ịtụ ụtụ nye eze Asịrịa dịka ọ na-eme kwa afọ. Nʼihi ya Shalmanesa nwụchiri ya, tinye ya nʼụlọ mkpọrọ.

5Eze Asịrịa wakporo ala ahụ niile nʼagha, gbagoo imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu, afọ atọ.

6Nʼafọ itoolu nke ọchịchị Hoshea, eze Asịrịa dọtara Sameria nʼagha, dọkpụrụ ndị Izrel niile buga ha nʼala Asịrịa. O mere ka ha biri nʼobodo Hala, nʼime Gozan nke dị nʼosimiri Hoboa, na nʼime obodo ndị Midia.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.