23“ ‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha.
24Ị ga-esi aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya?
25Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma enweghị okwu sitere na Chineke bịa? Ọ bụ Onyenwe anyị ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’ ”
26Mgbe ahụ, Eliakịm nwa Hilkaya, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik, ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.”
27Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?”