27Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?”
28Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa.
29Nke a bụ ihe eze sịrị, unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu site nʼaka m.
30Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi. Mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị, a gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’
31“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya: