30Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi. Mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị, a gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’
31“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:
32ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị, ala mmanụ aṅụ na osisi oliv jupụtara nʼime ya. Họrọnụ ndụ ka unu ghara ịnwụ. “Unu egela Hezekaya ntị, nʼihi na ọ bụ nrafu ka ọ na-arafu unu mgbe ọ na-asị, ‘Onyenwe anyị ga-anapụta anyị.’
33O nwere chi mba ọbụla nke napụtara ha site nʼaka eze Asịrịa?
34Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim, Hena na Iva nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m?