33O nwere chi mba ọbụla nke napụtara ha site nʼaka eze Asịrịa?
34Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim, Hena na Iva nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m?
35Olee chi nʼime chi mba ndị a niile bụ nke zọpụtarala ala ya site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?”
36Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.”
37Mgbe ahụ, Eliakịm nwa Hilkaya, onye na-elekọta ụlọeze, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf ode akwụkwọ, ha yi uwe ha dọwara adọwa, bịakwute Hezekaya gwa ya ihe niile onyeisi agha ahụ kwuru.