4O wepụrụ ebe niile dị elu, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. O tipịakwara agwọ bronz ahụ Mosis mere, nʼihi na ruo nʼoge ahụ, ụmụ Izrel na-esure aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ya. (A kpọrọ ya Nehushtan.)
5Hezekaya tụkwasịrị Onyenwe anyị, Chineke Izrel obi ya. Nʼezie, o nwekwaghị onye ọzọ dị ka ya nʼetiti ndị eze Juda niile, ndị bu ya ụzọ chịa, na ndị so ya.
6Ọ gbasoro Onyenwe anyị nʼụzọ niile. O sitekwaghị nʼụzọ Onyenwe anyị wezuga onwe ya. O debere ihe niile Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
7Onyenwe anyị nọnyeere ya nʼebe ọbụla ọ gara, ihe niile o mere gaara ya nke ọma. O nupuru isi jụ ịnọkwa nʼokpuru eze ndị Asịrịa, o fekwaghị ya ofufe.
8O tigburu ndị Filistia nʼala ha niile ruo na Gaza, na obodo dị ya gburugburu. Ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, obodo ukwu niile e wusiri ike na obodo nta niile a na-ewusighị ike.