2 Ndị Eze 19

Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, na ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya.

2 Kings 19:3 (UKJV) And they said unto him, Thus says Hezekiah, This day is a day of trouble, and of rebuke, and blasphemy; for the children are come to the birth, and there is not strength to bring forth.

1Mgbe eze Hezekaya, nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

2O zipụrụ Eliakịm onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ eze na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.

3Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, na ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya.

4Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ niile nke Rabashaka bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”

5Mgbe ndị ozi eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.