2 Ndị Eze 19

Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.

2 Kings 19:36 (UKJV) So Sennacherib king of Assyria departed, and went and returned, and dwelt at Nineveh.

34Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’ ”

35Nʼabalị ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.

36Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.

37Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.