2 Ndị Eze 19

Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,

2 Kings 19:9 (UKJV) And when he heard say of Tirhakah king of Ethiopia, Behold, he has come out to fight against you: he sent messengers again unto Hezekiah, saying,

7Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ”

8Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.

9Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,

10“Gwanụ Hezekaya, eze Juda, Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’

11Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.