2 Ndị Eze 2

O ruo mgbe Onyenwe anyị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal.

2 Kings 2:1 (UKJV) And it came to pass, when the LORD would take up Elijah into heaven by a whirlwind, that Elijah went with Elisha from Gilgal.

1O ruo mgbe Onyenwe anyị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal.

2Ịlaịja sịrị Ịlaisha, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Betel.” Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro gaa Betel.

3Nʼebe ahụ, ụmụ okorobịa ndị amụma nọ na Betel pụtara zute ha abụọ. Ndị amụma ahụ bịakwutere Ịlaisha sị ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-esi nʼebe ị nọ wepụ onyenwe gị Ịlaịja taa?” Ịlaisha sịrị, “Mụ onwe m maara, ma unu nọrọ nwayọọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.