2 Ndị Eze 23

Josaya kwadara ebe ịchụ aja niile nke ndị eze Juda wukwasịrị nʼelu ụlọeze, nʼelu elu ụlọ Ehaz. Ọ kwadakwara ebe ịchụ aja niile nke Manase wuru nʼime ogige abụọ nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kporo ha kpofuo nʼime Ndagwurugwu Kidrọn.

2 Kings 23:12 (UKJV) And the altars that were on the top of the upper chamber of Ahaz, which the kings of Judah had made, and the altars which Manasseh had made in the two courts of the house of the LORD, did the king beat down, and brake them down from thence, and cast the dust of them into the brook Kidron.

10Josaya merụrụ Tofet, laa ya nʼiyi. Tofet bụ ebe ịchụ aja dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. O mere nke a igbochi mmadụ ọbụla iji nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị chụọrọ chi Molek aja nsure ọkụ.

11O sitere nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị wepụ ịnyịnya ndị ahụ ndị eze Juda doro nsọ nye anyanwụ. Ịnyịnya ndị a dị nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị nʼebe dị nso nʼụlọ onyeozi aha ya bụ Netan-Melek. Josaya kpọrọ ụgbọ agha ndị a niile e doro nsọ nye anyanwụ ọkụ.

12Josaya kwadara ebe ịchụ aja niile nke ndị eze Juda wukwasịrị nʼelu ụlọeze, nʼelu elu ụlọ Ehaz. Ọ kwadakwara ebe ịchụ aja niile nke Manase wuru nʼime ogige abụọ nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kporo ha kpofuo nʼime Ndagwurugwu Kidrọn.

13Eze merụkwara ebe ịchụ aja niile dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo Jerusalem nʼakụkụ ndịda nke Ugwu Mbibi, nke Solomọn eze Izrel wuru nye chi Ashtọret, ihe arụ ndị Saịdọn, na chi Kemosh, ihe arụ ndị Moab, na chi Molek, ihe arụ ụmụ Amọn.

14Josaya kwadakwara ogidi nkume niile, gbutuo ihe arụsị Ashera niile, werekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ wụsa nʼelu ala ahụ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.