14Josaya kwadakwara ogidi nkume niile, gbutuo ihe arụsị Ashera niile, werekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ wụsa nʼelu ala ahụ niile.
15Josaya kwadakwara ogidi niile dị na Betel, nke Jeroboam nwa Nebat wuru mgbe o dubara ndị Izrel na mmehie. Ọ kwadara ebe ịchụ aja dị nʼebe ahụ, kụjisie nkume e doro nʼebe ahụ, gwerie ha dịka ntụ. Ọ kpọkwara arụsị Ashera ọkụ.
16Josaya legharịkwara anya gburugburu hụ ọtụtụ ili dị nʼelu ugwu. O ziri ndị ohu ya ka ha gaa chịpụtasịa ọkpụkpụ dị nʼili ahụ niile, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja imerụ ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke onye nke Chineke kwupụtara mgbe o buru amụma banyere ihe ndị a.
17Josaya jụrụ ndị guzo nʼebe ahụ ajụjụ sị, “Ọ bụ ili onye bụ nke a?” Ndị ikom obodo ahụ zara sị, “Ọ bụ ili onye nke Chineke ahụ si Juda bịa buo amụma megide ebe ịchụ aja Betel. O buru amụma na ihe ndị a ị na-eme ebe ịchụ aja a ga-emezu.”
18Mgbe ahụ, Josaya zara sị ha, “Hapụnụ ya ka o guzoro onwe ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịchịpụta ọkpụkpụ ya.” Ha hapụrụ ọkpụkpụ ya, hapụkwa ọkpụkpụ onye amụma ahụ si Sameria bịa.