2 Ndị Eze 23

Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Josaya na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?

2 Kings 23:28 (UKJV) Now the rest of the acts of Josiah, and all that he did, are they not written in the book of the chronicles of the kings of Judah?

26Ma ihe ndị a emeghị ka iwe ọkụ Onyenwe anyị na-ewe megide Juda dajụọ, bụ iwe a kpasuru ya nʼihi ihe ọjọọ niile nke Manase mere.

27Ya mere, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m ekpochapụ Juda niile site nʼihu m, dịka m si kpochapụ Izrel niile. Aga m ajụkwa obodo ahụ m họpụtara, bụ Jerusalem, jụkwa ụlọnsọ ukwu a nke m kwuru banyere ya sị, ‘Nʼime ya ka Aha m ga-adị.’ ”

28Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Josaya na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?

29Nʼoge Josaya bụ eze, Fero Neko, eze Ijipt, gbagoro gaa nʼakụkụ osimiri Yufretis inyere eze Asịrịa aka. Eze Josaya pụkwara izute ya nʼagha, ma Neko zutere ya nʼagha, gbuo ya na Megido.

30Ndị na-ejere Josaya ozi sị na Megido buru ozu ya nʼime ụgbọ agha bulata ya na Jerusalem, lie ya nʼili nke aka ya. Ndị ala ahụ kpọọrọ Jehoahaz nwa nwoke Josaya, tee ya mmanụ, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.