6O sikwa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ ogidi chi Ashera, wezuga ya nʼazụ Jerusalem, na Ndagwurugwu Kidrọn. Ebe ahụ ka ọ nọ suo ya ọkụ, supịa ya ka ọ ghọọ ntụ, fesaa ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu.
7Ọ kwadakwara ụlọ obibi ụmụ ndị ikom na-agba akwụna dị nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼebe ndị inyom na-anọ na-akpara Ashera akwa.
8O mere ka ndị nchụaja niile site nʼobodo Juda niile bịa, o merụkwara ebe ịchụ aja niile nke dị elu, site na Geba ruo Bịasheba, ebe ndị nchụaja ndị a nọrọ suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ọ kwatụrụ ọnụ ụzọ ama nke dị nʼebe ọnụ ụzọ ama Joshua, onye bụ gọvanọ obodo, nke dị nʼakụkụ aka ekpe nke ọnụ ụzọ ama obodo.
9Ma e kweghị ka ndị nchụaja ahụ jee ozi nʼụlọnsọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ma o nyere ha ike iso ndị nchụaja ndị ọzọ rie achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.
10Josaya merụrụ Tofet, laa ya nʼiyi. Tofet bụ ebe ịchụ aja dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. O mere nke a igbochi mmadụ ọbụla iji nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị chụọrọ chi Molek aja nsure ọkụ.