1Nʼoge Jehoiakim na-achị, Nebukadneza eze Babilọn ji ike bata nʼala ya, mee ka Jehoiakim ghọọ ohu ya afọ atọ. Ma o mesịrị tụgharịa megide Nebukadneza, nupukwa isi nʼokpuru ya.
2Onyenwe anyị zigara ndị na-apụnara mmadụ ihe site na Kaldịa, Aram, Moab na ndị Amọn, ka ha ga bibie Juda. Ọ bụ nʼusoro okwu Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma ya.
3Nʼezie, ihe ndị a bịakwasịrị Juda dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu, ka o si otu a kpochapụ ha site nʼihu ya nʼihi mmehie niile Manase mere, na dịka ihe niile o mere si dị,
4tinyere ọbara ndị aka ha dị ọcha nke ọ wusiri. Nʼihi na o mere ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta na Jerusalem. Onyenwe anyị ekwekwaghị agbaghara ajọ omume dị otu a.