1Nʼafọ nke itoolu nke ọchịchị ya, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, Nebukadneza, eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ọ mara ụlọ ikwu nʼazụ obodo ahụ, wukwaa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ.
2Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya.
3Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri.
4Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Kaldịa nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.