2 Ndị Eze 4

Ịlaisha biliri jegharịa nʼime ụlọ ahụ ugboro ole na ole, laghachikwa makpuru nʼelu nwantakịrị ahụ ọzọ. Emesịa, nwantakịrị ahụ zere uzere ugboro asaa, meghe anya ya abụọ.

2 Kings 4:35 (UKJV) Then he returned, and walked in the house back and forth; and went up, and stretched himself upon him: and the child sneezed seven times, and the child opened his eyes.

33Ọ banyere nʼime ọnụụlọ ahụ, mechibido ha abụọ ụzọ, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị.

34Emesịa, ọ makpuuru nʼelu nwantakịrị ahụ, tụkwasị ọnụ ya nʼọnụ nwantakịrị ahụ, na anya ya abụọ na nke nwantakịrị ahụ, na aka ya abụọ na nke ya. Mgbe o si otu a dinara nʼelu nwantakịrị ahụ, ahụ nwantakịrị ahụ malitere ikpo ọkụ ọzọ.

35Ịlaisha biliri jegharịa nʼime ụlọ ahụ ugboro ole na ole, laghachikwa makpuru nʼelu nwantakịrị ahụ ọzọ. Emesịa, nwantakịrị ahụ zere uzere ugboro asaa, meghe anya ya abụọ.

36Ịlaisha kpọrọ Gehazi sị ya, “Kpọọ nwanyị Shunem.” Ya mere, ọ kpọrọ ya. Mgbe ọ bịakwutere ya, ọ sịrị, “Kuru nwa gị.”

37Ọ batara, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọ isiala. Emesịa, o kuuru nwa ya nwoke pụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.