2 Ndị Eze 4

Ya mere, o chere ya nʼihu ha, ha rikwara, nri ahụ fọdụkwara dịka okwu Onyenwe anyị si dị.

2 Kings 4:44 (UKJV) So he set it before them, and they did eat, and left thereof, according to the word of the LORD.

42Otu nwoke si Baal-Shalisha bịa, butere onye nke Chineke ogbe achịcha iri abụọ nke e ji ọka balị mbụ a ghọtara nʼubi mee. O butekwaara ya isi ọka ole na ole nʼakpa. Ịlaisha sịrị, “Were ihe ndị a nye ndị anyị ka ha rie.”

43Onye na-ejere ya ozi jụrụ, “Olee otu m ga-esi chee ihe a nʼihu narị mmadụ?” Ma Ịlaisha zara, “Chịrị ya nye ndị mmadụ a ka ha rie, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ha ga-eriju afọ ha, nwekwa ndị ga-afọdụkwa.’ ”

44Ya mere, o chere ya nʼihu ha, ha rikwara, nri ahụ fọdụkwara dịka okwu Onyenwe anyị si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.