2 Ndị Eze 4

Nwanyị ahụ hapụrụ ya, ga mechibido onwe ya na ụmụ ya ndị ikom ụzọ. Ha na-ebutere ya ite niile ahụ nso, ebe ya onwe ya na-agbanye agbanye nʼime ha.

2 Kings 4:5 (UKJV) So she went from him, and shut the door upon her and upon her sons, who brought the vessels to her; and she poured out.

3Ịlaisha sịrị, “Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole.

4Mgbe ahụ, baa nʼime ụlọ, gị na ụmụ gị, mechibido onwe unu ụzọ. Malite ịgbanye mmanụ ahụ nʼime ite ahụ niile, mgbe nke ọbụla juru, bupụ ya nʼotu akụkụ.”

5Nwanyị ahụ hapụrụ ya, ga mechibido onwe ya na ụmụ ya ndị ikom ụzọ. Ha na-ebutere ya ite niile ahụ nso, ebe ya onwe ya na-agbanye agbanye nʼime ha.

6Mgbe ọ gbajuru ite ndị ahụ niile, ọ sịrị nwa ya, “Butere m ite ọzọ.” Ma ọ zara, “O nweghị ite ọzọ fọdụrụ.” Mgbe ahụ, mmanụ ahụ kwụsịrị ịgbapụta.

7Ọ gara gwa onye nke Chineke ahụ, onye sịrị, “Gaa, ree mmanụ ahụ, kwụkwaa ụgwọ unu ji. Gị na ụmụ gị ndị ikom were nke fọdụrụ mee mkpa dịrị unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.