19Ịlaisha zara sị ya, “Ọ dị mma, laa nʼudo.” Mgbe Neeman lawara, o jerubeghị ebe dị anya,
20Gehazi, bụ onyeozi Ịlaisha onye nke Chineke, sịrị nʼobi ya, “Nna m ukwu emezighị ikwere ka Neeman onye Aram laa na-anataghị ya ihe o ji bịa. Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m eji ọsọ gbakwuru ya napụta ya ụfọdụ ihe ahụ.”
21Ya mere, Gehazi gbara ọsọ gbakwuru Neeman. Mgbe Neeman hụrụ ya ka ọ gba ọsọ na-abịa, o si nʼelu ụgbọ agha ya wudata gaa zute ya, jụọ ya sị: “Udo ọ dịkwa?”
22“E, udo dị,” ka Gehazi zara, “Onyenwe m zitere m ka m gwa gị, ‘Lee, ụmụ okorobịa abụọ nʼetiti ndị amụma si nʼugwu Ifrem bịakwute m. Biko nye ha otu talenti ọlaọcha na uwe mgbanwe abụọ.’ ”
23Ma Neeman zara sị ya, “Biko, were talenti abụọ.” Ọ kwagidere Gehazi ka ọ nara ha. O kechiri talenti ọlaọcha abụọ ahụ nʼakpa abụọ, tinyere uwe mgbanwe abụọ. O bunyere ndị ohu ya ka ha buru ya na-aga nʼihu Gehazi.