22“E, udo dị,” ka Gehazi zara, “Onyenwe m zitere m ka m gwa gị, ‘Lee, ụmụ okorobịa abụọ nʼetiti ndị amụma si nʼugwu Ifrem bịakwute m. Biko nye ha otu talenti ọlaọcha na uwe mgbanwe abụọ.’ ”
23Ma Neeman zara sị ya, “Biko, were talenti abụọ.” Ọ kwagidere Gehazi ka ọ nara ha. O kechiri talenti ọlaọcha abụọ ahụ nʼakpa abụọ, tinyere uwe mgbanwe abụọ. O bunyere ndị ohu ya ka ha buru ya na-aga nʼihu Gehazi.
24Ma mgbe ha rutere nʼugwu, Gehazi naara ndị ohu Neeman ihe ndị ahụ, sị ha laghachikwa. O zoro ihe ndị ahụ nʼime ụlọ.
25Mgbe ọ batara nʼụlọ guzo nʼihu nna ya ukwu, Ịlaisha jụrụ ya sị, “Ebee ka i si na-abịa Gehazi?” Ọ zara, “Ohu gị ejeghị ebe ọbụla.”
26Mgbe ahụ Ịlaisha zara ya, “Ọ bụ na mmụọ m esoghị gị mgbe nwoke ahụ si nʼụgbọ ya rịdata izute gị? Oge a ọ bụ oge ịnara ego, na ịnara uwe, na ịnara ubi oliv, na ubi vaịnị, na igwe ehi, na igwe atụrụ, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom na-eje ozi?