2 Ndị Eze 5

Ngwangwa eze Izrel gụrụ akwụkwọ ahụ, ọ dọwara uwe ya sị, “Abụ m Chineke? A pụrụ m ime ka mmadụ nwụọ na ime ka mmadụ dị ndụ? Gịnị mere nwoke a ji ezitere m onye m ga-agwọ ọrịa ekpenta? Lee ka o si na-achọ ụzọ anyị ga-eji nwee esemokwu.”

2 Kings 5:7 (UKJV) And it came to pass, when the king of Israel had read the letter, that he rent his clothes, and said, Am I God, to kill and to make alive, that this man does send unto me to recover a man of his leprosy? wherefore consider, I pray you, and see how he seeks a quarrel against me.

5Eze Aram sịrị, “Bilie, gaa, aga m ezigakwara eze Izrel akwụkwọ ozi.” Ya mere Neeman gara, ọ chịịrị talenti ọlaọcha iri, na puku shekel ọlaedo isii, na uwe ọma dị iche iche, nke dị iri nʼọnụọgụgụ.

6Nke a bụkwa ihe dị nʼime akwụkwọ ahụ eze Aram degaara eze Izrel: “Nwoke a ji akwụkwọ a bịakwute gị bụ Neeman, onyeisi ndị agha m. Biko, achọrọ m ka ị gwọọ ya ọrịa ekpenta dị ya nʼahụ.”

7Ngwangwa eze Izrel gụrụ akwụkwọ ahụ, ọ dọwara uwe ya sị, “Abụ m Chineke? A pụrụ m ime ka mmadụ nwụọ na ime ka mmadụ dị ndụ? Gịnị mere nwoke a ji ezitere m onye m ga-agwọ ọrịa ekpenta? Lee ka o si na-achọ ụzọ anyị ga-eji nwee esemokwu.”

8Mgbe Ịlaisha onye Chineke nụrụ na eze Izrel dọwara uwe ya, o ziri ozi a zigara ya sị, “Gịnị mere i ji dọwaa uwe gị? Zitere m Neeman. Ọ ga-amatakwa na e nwere onye amụma nʼIzrel.”

9Ya mere, Neeman bịarutere guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ Ịlaisha, ya na ịnyịnya ya, na ụgbọ agha ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.