2 Ndị Eze 6

Nʼihi ya, nʼotu anyasị eze Aram zigara ọtụtụ ndị agha ya, ndị ji ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu.

2 Kings 6:14 (UKJV) Therefore sent he thither horses, and chariots, and a great host: and they came by night, and compassed the city about.

12Otu onye nʼime ndị ọchịagha ya sịrị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị, onyenwe m bụ eze. Ọ bụ Ịlaisha, onye amụma Izrel, bụ onye na-agwa eze Izrel okwu niile i na-ekwu nʼime ebe ndina gị.”

13Ya mere, eze Aram nyere ha iwu sị ha, “Gaanụ, chọpụta ebe ọ nọ, ka m ziga ndị agha ga-aga jide ya.” Ha gara lọta, kọọrọ ya na Ịlaisha nọ na Dọtan.

14Nʼihi ya, nʼotu anyasị eze Aram zigara ọtụtụ ndị agha ya, ndị ji ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu.

15Mgbe onye na-ejere onye nke Chineke ozi biliri ọtọ nʼisi ụtụtụ pụọ, ọ hụrụ ọtụtụ ndị agha na ịnyịnya na ụgbọala, ka ha gbara obodo ha nọ gburugburu. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m, gịnị ka anyị ga-eme ugbu a?”

16Ma Ịlaisha zara sị ya, “Atụla egwu, nʼihi na ndị nọnyere anyị dị ọtụtụ karịa ndị nọnyeere ha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.