2 Ndị Eze 7

Ọ bụkwa otu a ka o si mee, nʼihi na ndị mmadụ zọgburu ya nʼụkwụ nʼọnụ ụzọ ama, ebe ọ nọ nwụọ.

2 Kings 7:20 (UKJV) And so it fell out unto him: for the people trode upon him in the gate, and he died.

18Ihe niile mezuru dịka onye nke Chineke gwara eze okwu sị ya, “A ga-ere akpa nta ọka balị abụọ otu shekel na otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, nʼọnụ ụzọ ama Sameria.”

19Nʼoge ahụ, ọchịagha ahụ na-ejere eze ozi zara sị ya, “Ihe dị otu a agaghị eme, ọ bụladị na Onyenwe anyị emeghee eluigwe mee ka nri zoo, nke a ọ ga-eme?” Ma onye nke Chineke zara ya, “Ị ga-eji anya gị hụ ya, ma ị gaghị eso rie ya.”

20Ọ bụkwa otu a ka o si mee, nʼihi na ndị mmadụ zọgburu ya nʼụkwụ nʼọnụ ụzọ ama, ebe ọ nọ nwụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.