2 Ndị Eze 9

Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’ ” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ.

2 Kings 9:10 (UKJV) And the dogs shall eat Jezebel in the portion of Jezreel, and there shall be none to bury her. And he opened the door, and fled.

8Ezinaụlọ Ehab ga-abụ ihe lara nʼiyi. Nʼala Izrel, m ga-esite nʼezinaụlọ Ehab bipụ ndị ikom niile, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya.

9M ga-ala ụlọ Ehab nʼiyi, ka m si laa ezinaụlọ Jeroboam nwa Nebat nʼiyi, na dịka m si lakwaa ezinaụlọ Baasha, nwa Ahija nʼiyi.

10Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’ ” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ.

11Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.”

12Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.” Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a Onyenwe anyị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.